Exodus 5

Mosis nʼihu Fero

1Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’ ”

2Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.”

3Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ
Nʼala Ijipt ehi na oke ehi bụ anụmanụ a na-ahụta ka ihe dị nsọ. Ya mere, ndị Izrel ji sị na ha ga-aga njem abalị atọ nʼime ọzara nọrọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị aja.
nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.”

4Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!” 5Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.”

6Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta
Ndị nlekọta ndị ohu na-arụ ọrụ bụ ndị Ijipt, ma ndịisi ndị ọrụ ahụ, bụ ndị Izrel.
ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị,
7“Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik
Brik bụ ụrọ a gwakọtara ya na okporo ọka. Ọ bụ okporo ọka ahụ e tinyere ya na-enye aka ime ka o sie ike mgbe a na-amị ya nʼanwụ. Nʼoge owuwe ihe ubi, a na-egbupụ elu okporo ọka, ma hapụ ogwe ya. Ọ bụ ogwe ya ahụ, ka ụmụ Izrel na-egburu, gwakọta ya nʼụrọ jiri ya kpụọ brik.
dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha.
8Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’ 9Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.”

10Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ. 11Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’ ” 12Ya mere ndị ha gbasasịrị nʼala Ijipt niile ịchịkọta okporo ahịhịa ha ji akpụ brik. 13Ndị na-achị ha nọgidere na-akwagide ha sị ha, “Rụchaanụ ọrụ unu kwesiri ịrụ nʼụbọchị dịka unu si arụ ya mgbe a na-enye unu ahịhịa.” 14Ndịisi ọrụ Fero malitere iti ndị Izrel ha họpụtara maka inyere ha aka ilekọta ndị ọrụ ihe, na-ajụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu akpụtaghị oke ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụta ụnyaahụ maọbụ taa?”

15Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso? 16Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.”

17Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’ 18Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”

19Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.” 20Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha. 21Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”

Nkwa mgbapụta nke Chineke kwere

22Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m? 23Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”

Copyright information for IboBIU